Arụmọrụ Ndọ-Ndọ Ukwuu Ahu 2.0
Sonye n’ikesa nde kurunụ nde mpempe akwụkwọ nime afọ 2023 na 2024, iji nọ na njikere maka nloghachi nke Jisọs.


Ellen G. White
Onye-soro na ịchọpụta Seventh-day Adventist Church
Ọdịm oke mkpa ịhụ na akwụkwọ nkaa gbasara n’ebe nile karịa ndi ọzọ nihi na nime Ndọ-Ndọ Ukwuu Ahụ, ozi nke ịdọ aka na ntị ikpe azụ nye ụwa pụtara ihe nke ọma karịa akwụkwọ m ndi ọzọ.
Mbudata ha
Asụsụ dị iche-iche
Onye nwe anyị metụrụ m aka n'obi ide akwụkwọ a ka e wee nwee ike ịgbasa ya n'elu ụwa dum n'egbughi oge ọbụla n'ihi na ịdọ aka ná ntị dị n'ime akwụkwọ a dị mkpa iji jikere ndị mmadụ ka ha wee nwee ike iguzo n'ụbọchị nke Onye nwe anyị.

ELLEN G. WHITE, AKWỤKWỌ MPIAKỌTA 24, 1891
Budata Ndọ-Ndọ Ukwuu Ahụ na ihe ndi ọzo g’enye aka

Nchịkọta
I chere na Ụwa na-akawanye mma ka ọ bụ na ọ na-akawanye njo? Ná-enweghi ịtụnanya ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ taa kwenyere na Ụwa a na-akawanye njo. Eleghi anya, enweghị nchekwube a zuru ụwa niile ọnụ na ụwa a na-akawanye njo bụ ihe kpatara usoro obibi ndụ nke jupụtara n'akụkọ ọjọọ maọbụ, eleghi anya, na anyị maara nke ọma n'eziokwu nke pụtara ihe egosiputara n'ihe n'akwụkwọ a na ekwu maka ya: E nwere nnọọ ihe dị njọ n'ụwa anyị ma anyị enweghi ike imezi ya.
Ndọ-Ndọ Ukwuu Ahụ a, abụghị naanị na ọ na-ekpughe mmalite nke mgbuda nke ọdịdị mmadụ, kama ọ na-kpughekwa ndọgbu nke weere oke ike na ikike eme ya nke na-aga gburugburu ụwa niile na egwu ya; nrụrụ aka na igbu ọtụtụ mmadụ, igbu mmadụ na ọgbaghara dị iche iche. N'ime ọrụ a nke dị ịtụnanya, Ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ nwere ihu; ihe ọma nwere Onye mmeri ebe mmehie nwere ọgwụgwụ. Ọ bụrụ na Ị chọrọ ịdị na njikere maka ọgwụgwụ nke ụwa a nakwa ụwa ebube nke na-abịa, Ị ga-agụrịrị akwụkwọ a.
Asụsụ::
Ihe ndi ha anebudata ọtụtụ mgbe